Igbo Mass Readings for June 9 2027, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 9 2027, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:4-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Nke a bụ ntụkwasịobi anyị nwere site na Kristi n’ebe Chineke nọ. Ọ bụghị na anyị zuruoke n’onwe anyị ịnyaisi n’ihe ọbụla, dịka a ga-asị na o nwere ihe ọbụla siri n’aka anyị pụta, kama izuoke anyị si n’aka Chineke.
Onye nke mere ka anyị bụrụ ụmụodibo nke ọgbụgbandụ ọhụrụ, nke edeghị n’akwụkwọ iwu kama n’ime Mmụọ. Ihe e dere n’akwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ndụ.
Ugbu a, ọ bụrụ na iwu nke na-ekesa ọnwụ, nke e dere na mbadamba nkume jiri ebube dị egwu bịa, nke mere na ụmụ Izrel enweghị ike ilekwasị Mosis anya n’ihu n’ihi mmukesi ya.
Nke anaghị adịgide, ọ bụ na ọrụ nke Mmụọ agaghị adị ebube karịa? Ọ bụrụ na e nwere ebube n’ime nkesa nke amamikpe, nkesa nke eziomume ga-adị ebube karịa ya.
N’eziokwu ihe jupụtara n’ebube mgbe ochie enweghịkwa ebube ọbụla ugbu a, n’ihina ebube nke ọgbụgbandụ ọhụrụ ekpuchiela ya.
Ọ bụrụ na ihe na agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 99: 5, 6, 7, 8, 9
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ.
1. Ka anyị bulienụ Onyenweanyị Chineke anyị elu,
kpọọnụ isi ala n’ihu ya;
ọ dị nsọ.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ.
2. Mosis na Erọn so na ndị ụkọchukwu ya,
Samuel so na ndị na-akpọku aha ya;
ha kpọkuru Onyenweanyị; ọ zara ha.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ.
3. Ọ gwara ha okwu site n’ide igweojii,
ha dobere iwu niile o nyere ha.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ.
4. Onyenweanyị Chineke anyị, ị zara ha mgbe ha kpọrọ gị;
n’ebe ụmụ Izrel nọ ị bụ Chineke onye mgbaghara,
mana ị hapụghị ịta ha ahụhụ maka njọ ha.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ.
5. Bulienụ Onyenweanyị Chineke anyị elu,
sekpuoronụ ya n’ihu ugwu ya dị nsọ;
n’ihina Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ.
MBEKU – Luk 8:15
Alleluia, Alleluịa:
Añụrị ga adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:17-19
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ echekwala na m bịara imebi iwu Mosis na nkuzi ndị amụma. Abịaghị m imebi ha; kama abịara m imejupụta ha.
N’eziokwu, agwa m ụnụ, ruo mgbe eluigwe na ala ga agabiga, ọ dịghị otu ihe ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịchara nta, nke a ga-esi n’iwu Chineke wepụ ruo mgbe emezuru ha niile.
Ya bụ, onye ọbụla ga-emebi otu n’ime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịchara nta, ma kuzikwaara ndị mmadụ ime otu ahụ, ga-abụ onye dịkarịchara nta n’alaeze eluigwe.
Ma onye ọbụla na-edobe ha, ma na-akụzikwa ha, ga abụ nnukwu mmadụ n’alaeze eluigwe.
Igbo Mass Readings for June 10 2027, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for June 9 2027, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.