Igbo Mass Readings for June 10 2026, Wenezde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 10 2026, Wenezde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:20-39

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze

Ahab kpọkọtara ụmụ Izrel na ndị amụma ahụ ọnụ n’ugwu Kamel. Elaịja bịarutere ha nso jụọ ha sị, “Olee mgbe ụnụ ga enwe otu ebe ụnụ kwụ? Ọ bụrụ na Yahweh bụ Chineke, sobenụ ya; ma ọ bụrụkwanụ Baal, sobenụ ya. Ndị mmadụ azaghị ya ihe ọbụla.

Ọ gakwara n’ihu jụọ ha sị, “Ndị amụma nke Yahweh ha fọdụrụ ole? Ọ bụ sọọsọ mụ onwe m. Ma ndị nke Baal dị narị anọ na iri ise. Ngwa nyenụ anyị oke ehi abụọ. Ha họrọ otu ehi, gburisịa ya, tọgbọ ha n’elu nkụ ma ha amụnyekwala ha ọkụ. Aga m emekwa ehi nke m otu ihe ahụ, agaghị m etinyekwa ọkụ.

Ha kpọkuo chi ha na-efe, ma m kpọkuokwanụ Yahweh m. Onye nke zara site n’izite ọkụ, ọ bụ ya bụ Chineke ezie.” Ndị mmadụ azaa sị ya, “Otu a dị mma.” Elaịja agwa ndị amụma Baal ahụ sị, “burunụ ụzọ họrọ otu oke ehi kwadoo n’ihina ụnụ dị ọtụtụ.

Ụnụ amụnyekwala ya ọkụ ma kpọkuwenụ chi ụnụ na-efe.” Ha were otu oke ehi ahụ e nyere ha kwado ya. Ha bidoro n’ụtụtụ kpọkugide Baal ruo n’ehihie, na agba egwu gburugburu ekwuaja ha ahụ na-asị, “Biko Baal zanụ anyị o!”

Ma o nweghị olu ọbụla ha nụrụ, o nwekwaghị onye zara ha. N’etiti ehihie, Elaịja malitere mewe ha akaja na-asị; “Ọ kwa ụnụ sị na ọ bụ chi, kpọsienụ ya ike, ikekwe ọ nọ n’echiche, mọbụ na-ezu ike, mọbụ na ọ pụrụ apụ, ikekwe ọ na-arahụ ụra nke na ọ dị mkpa na a ga-akpọte ya.”

Ha tisiri mkpu ike, were mmaagha na ube merụchaa onwe ha ahụ dịka usoro ha si dị, nke n’ọbara na-agụsịsị ha n’ahụ. Ka ehihie gafere ha tikwaara ka ndị ara na-aga ruo mgbe e ji achụnye aja onyinye ma o nweghị ihe ha nụrụ, o nweghị onye zara ha, o nwekwaghị onye gere ha ntị.

Elaịja abịa gwa ndị mmadụ ahụ niile sị ha, “Bịanụ m nso.” Ha abịaruo ya nso dịka ọ gwara ha. Ọ rụziri ekwuaja nke Chineke ahụ a kuturu akutu. Elaịja e were okwute iri na abụọ nke nọchitere anya agbụrụ ụmụ Jekọb onye nke Osebụrụwa gwara sị; “Izrel ga-abụ aha gị.” rụọrọ Yahweh ebe nchọaja.

Ọ gwukwara olulu gburugburu ekwuaja ahụ nke nwere ike ịbata ite mmiri iri na anọ. Ọ hazie nkụ ahụ, bọkwaa ehi ahụ, gburicha ya, tọgbọ ha n’elu nkụ ahụ. Ọ gwa ndị mmadụ sị, “kutenụ ite mmiri anọ wụọ n’elu nkụ na ihe aja nsureọkụ ahụ.” Ọ gwara ha sị, “Mekwaanụ ya ọzọ,” ha emee ya nke ugboro abụọ.

Ọ sịkwa ha mee ya nke ugboro atọ. Ha emekwaa otu ahụ. Mmiri jupụtara ekwuaja ahụ tojuokwa olulu ahụ dị ya gburugburu. Mgbe oge ịchụ aja onyinye ruru, Elaịja onye amụma kwụpụtara, tikuo Chineke sị, “O Yahweh Chineke nke Abraham, Aịzik na Izrel, mee ka a mata n’ụbọchị taa n’Izrel na Ị bụ Chineke nakwa na mụ onwe m bụ nwodibo gị, na m mekwara ihe ndị a dịka i si gwa m.

Zaa m O Onyenwanyị, zaa m ka ndị a mata na gị Yahweh bụ Chineke, ka ha matakwa na ị gbanweela obi ha.” Mgbe ahụ ọkụ nke Yahweh dara were repịa ihe niile, ma ihe nchụaja, ma nkụ, ma okwute, ma ntụ bịa mịkọchakwa mmiri dọọrọ n’olulu ahụ.

Ka ndị mmadụ hụrụ nke a, ha makpuru, kpudochaa ihu n’ala na-ekwu sị, “Yahweh bụ Chineke, ee ọ bụ Chineke n’ezie.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 16: 1-2, 4, 5, 8, 11

Aziza: Chekwaba m Chineke, n’ihina Ị bụ ebe mgbaba m

1. Chekwaba m Chineke, n’ihina Ị bụ ebe mgbaba m.

Agwara m Onyenweanyi sị, ‘Gịnwa bụ Chineke m.’

Aziza: Chekwaba m Chineke, n’ihina Ị bụ ebe mgbaba m

2. Nsogbu dị icheiche na-adakwasị

ndi niile na-agbakwuru chi ọzọ.

Agaghị m esonye n’aja ha na-achụ;

agaghị m efe arụsị ha.

Aziza: Chekwaba m Chineke, n’ihina Ị bụ ebe mgbaba m

3. Sọ gị Onyenweanyị bụ ihe m nwere,

Ị na-enyekwa m ihe niile m chọrọ

Ana m eche echiche banyere Onyenweanyị mgbe niile,

n’ebe Ọ nọ n’aka nri m, egwu agaghị atụ m.

Aziza: Chekwaba m Chineke, n’ihina Ị bụ ebe mgbaba m

4. Ị ga-akụziri m ụzọ nke ndụ,

Ị ga-enye m añụrị na-enweghị ube n’ihu gị

n’aka nri gị aga m enwe añụrị dị ebeebe.

Aziza: Chekwaba m Chineke, n’ihina Ị bụ ebe mgbaba m

MBEKU – Luk 8:15

Alleluia, Alleluịa:

Añụrị ga adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 5:17-19

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ echekwala na m bịara imebi iwu Mosis na nkuzi ndị amụma. Abịaghị m imebi ha; kama abịara m imejupụta ha.

N’eziokwu, agwa m ụnụ, ruo mgbe eluigwe na ala ga agabiga, ọ dịghị otu ihe ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịchara nta, nke a ga-esi n’iwu Chineke wepụ ruo mgbe emezuru ha niile.

Ya bụ, onye ọbụla ga-emebi otu n’ime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịchara nta, ma kuzikwaara ndị mmadụ ime otu ahụ, ga-abụ onye dịkarịchara nta n’alaeze eluigwe.

Ma onye ọbụla na-edobe ha, ma na-akụzikwa ha, ga abụ nnukwu mmadụ n’alaeze eluigwe.

Igbo Mass Readings for June 11 2026, Emume Barnabas dị Asọ

Igbo Mass Readings for June 10 2026, Wenezde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.