Igbo Mass Readings for May 28 2025, Wenezde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 28 2025, Wenezde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:15, 22-34; 18:1

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Ndị dupụrụ Pọl kpọruru ya n’obodo Atens, tupu ha alaghachi na Beroa. Mgbe ha na-ala Pọl ziri ha ozi ka Saịlas na Timoti gbaa mbọ, bịakwute ya ọsọọsọ.

Pọl guzoro n’etiti nzukọ Ariopagus wee sị: “Ndị Atens! Achọpụtara m na n’ụzọ ọbụla na ụnụ na-ekpere chi dị iche-iche. N’ihina ka m na- akpagharị n’obodo ụnụ, ahụrụ m ihe niile ụnụ ji efe chi ụnụ; ahụrụ m otu ebe ekwuaja nke e dekwasara n’elu ya, ihe e nyere chi nke amaghị ama.

Chi ahụ ụnụ na-ekpere na-amaghị ama ka m na-ekwusara ụnụ Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, bụ Chineke nke eluigwe na ụwa. Ọ naghị ebi n’ụlọ arụsị nke mmadụ mebere,

Ọ dịghị anara ije ozi n’aka mmadụ dịka aga asị na o nwere ihe kọrọ ya, n’ihina ya onwe ya na-enye mmadụ niile ndụ, ume na ihe niile. O sitere n’aka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ n’otu n’otu, ka ha biri n’elu ụwa niile.

O jiri aka ya na mbụ kewachaa oge ọgbọ ọbụla na ndụdụgandụ ọbụla, ga-achịdebe. O kewakwara oke ala n’etiti mba na mba, Chukwu kere ihe ndị a niile, ka ụmụ mmadụ chọba ya.

O bu n’obi na, eleghị anya, ọ ga-adị ha mkpa, ịchọ Chineke chọta ya. Ma otu ọ dị Chineke nọ onye ọbụla n’ime anyị nso, n’ihina ‘N’ime ya ka anyị na-adị ndụ, na-agagharị, na-adịkwa;’ ọ bụladị ụfọdụ n’ime ụnụ ndị na-ede abụ, ekwuola otu ụdị okwu ahụ sị, ‘N’eziokwu, anyị bụkwa ụmụ ya.”

Ebe anyị bụ ụmụ Chineke, o kwesịghị ka anyị na-eche na Chineke yiri ihe e jiri ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, ma ọ bụ nkume rụọ, ọrụ aka nke mmadụ chepụtara n’obi ya.

Chineke lefuru anya n’oge niile nke amaghị ihe. Ma ugbu a ọ na-enye mmadụ niile iwu n’ebe niile, ka ha niile chegharịa. N’ihina o wepụtara otu ụbọchị mgbe ọ ga-eji eziomume kpee ụwa niile ikpe, site n’aka otu nwoke ọ họpụtara.

O nyela mmadụ niile ihe ha ga-eji kwere nke a, site n’ime ka o si n’ọnwụ bilie.” Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite n’ọnwụ, ụfọdụ n’ime ha jiri ya mee ihe ọchị.

Ụfọdụ sịrị: “Ị ga-akọrọ anyị akụkọ a ụbọchị ọzọ.” Nke a mere Pọl jiri si n’etiti ha pụọ. Ma ụfọdụ ndị mmadụ sonyere ya ma kwere, ụfọdụ n’ime ha bụ Diyonịshus, onye Ariopagus, ya na otu nwaanyị a na-akpọ Damaris, na ndị ọzọ. Mgbe ihe ndị a gachara, o siri n’Atens pụọ gaba Kọrịnt.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 148:1-2, 11- 12, 13, 14.

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara na otito gị Onyenweanyị.

1. Si n’eluigwe too Onyenweanyị,

toonụ ya n’ebe kacha elu.

Toonụ ya ndị mmụọozi ya niile,

toonụ ya, igwe ndị agha ya niile.

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara na otito gị Onyenweanyị.

2. Ndịeze niile nọ n’ụwa, na mba niile;

ụmụ ndịeze niile, na ndị ọchịchị nọ n’ime ụwa.

Ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa,

ndị okenye nakwa ụmụ ntakịrị.

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara na otito gị Onyenweanyị.

3. Ka ha niile too aha Onyenweanyị,

n’ihi na sọọsọ aha ya dị omimi,

ebube ya karịrị eluigwe na ụwa.

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara na otito gị Onyenweanyị.

4. Ọ na-ewelite ike nke ndị nke ya,

maka otito ndị ya dị nsọ,

nke ụmụ Izrel bụ ndị ọ hụrụ n’anya.

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara na otito gị Onyenweanyị.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Anyị maara na Kristi ebilitela n’ọnwụ, eze nke mmeri bịa nọnyere anyị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 16: 12-15.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Enwekwara m ọtụtụ ihe ndị ọzọ m ga-agwa ụnụ, ma ụnụ agaghị anabatalị ha ugbu a. Mgbe Mmụọ nke eziokwu ahụ bịara,

Ọ ga-eduba ụnụ n’eziokwu niile. Ọ gaghị ekwu n’ike aka ya, ma ọ ga-ekwu ihe niile ọ nụrụ, kọkwara ụnụ ihe gaje ịbịa. Ọ ga- enyekwa m otito, n’ihi na ọ ga-esite n’aka m nata ihe ọ ga-akọrọ ụnụ.

Ihe niile Nna m nwere bụ nke m. Nke a ka m ji sị na Mmụọ Nsọ ga-esite n’aka m nata ihe ọ ga-akọrọ ụnụ.

Igbo Mass Readings for May 29 2025, Nnukwu Emume Nrọgoro n’Eluigwe nke Dinwenụ Jesu Kristi.

Igbo Mass Readings for May 28 2025, Wenezde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.