Igbo Mass Readings for June 3 2026, Wenezde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 3 2026, Wenezde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-3, 6-12
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Timoti
Pọl onyeozi nke Jesu Kristi, site n’ọchịchọ nke Chineke, dịka nkwa nke ndụ ahụ dị n’ime Jesu Kristi siri dị, na-edegara Timoti, nwa m hụrụ n’anya, akwụkwọ ozi nke a.
Ka amara, ebere na udo nke si n’aka Chukwu Nna na Onyenweanyị Jesu Kristi dịịrị gị. Ana m ekele Chineke, onye m ji ezi akọnuuche ejere ozi, otu ndị nna nna m ha siri mee.
Ana m echeta gị n’ekpere oge niile. Ya mere, ana m echetara gị ka i mee ka onyinye nke Chineke nyere gị mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ na-enwu dịka ọkụ.
Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ kama mmụọ nke ike, nke ịhụnaanya na nke ịkwanyere onwe anyị ugwu.
Ihere emela gị ịgbara Onyenweanyị mọbụ mụnwa bụ onyemkpọrọ n’ihi ya, akaebe. N’ike nke Chineke, kerekwa oke nke gị n’ahụhụ dịịrị gị n’ihi oziọma ahụ.
Chineke zọpụtara anyị, wee kpọọ anyị ị bụrụ ya ndị nsọ. Ọ bụghị n’ihi ọrụ ọma anyị, kama n’ihi amara na nzube ya. O nyere anyị amara nke a n’ime Jesu Kristi tupu e kee ụwa.
O gosịpụtara nke a ugbu a site na mpụta ihe nke onye nzọpụta anyị Jesu Kristi. O mebiri ọnwụ, wetara anyị ndụ, bịa mee ka anwụ anwụ pụta ihe site n’oziọma ahụ.
N’ihi oziọma nke a, a họpụtara m ka m bụrụ onye nkwusa oziọma onyeozi na onyenkụzi. Ọ bụ n’ihi ya ka m ji ata ahụhụ ndị a.
Mana ihere anaghị eme m n’ihina amaara m onye m kwenyere na ya. O doro m anya na ọ pụrụ ichekwa ihe o tinyere m n’aka ruo ụbọchị ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA -Ps. 123: 1-2, 2
Azịza: Onyenweanyị elelitela m anya m n’ebe ị nọ.
1. Elelitela m anya m n’ebe ị nọ,
gị onye bi n’igwe!
Lee, dịka ụmụodibo
si ele nna ha ukwu anya n’aka.
Azịza: Onyenweanyị elelitela m anya m n’ebe ị nọ.
2. Otu odibo nwaanyị
si ele nne ya ukwu anya n’aka,
otu a ka anyị si ele Onyenweanyị bụ Chineke anyị anya,
wee ruo mgbe o gosịrị anyị ebere ya.
Azịza: Onyenweanyị elelitela m anya m n’ebe ị nọ.
MBEKU – Ps. 111:8
Alleluia, Alleluia:
Iwu nke Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’ụzọ niile, nke a mere ka ọ dị ebeebe ebeebe.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:18-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Maak dere
Ụfọdụ ndị Sadụsii ndị na-ekweghị na mbilite n’ọnwụ, bịakwutere Jesu jụọ ya sị, “Onyenkuzi, Mosis denyere anyị iwu, na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-ekuchi nwunye ya ahụ were mụta ụmụ n’aha nwanne ya ahụ nwụrụ anwụ.
O nwere ụmụnne asaa dịnụ, onye nke mbụ n’ime ha lụrụ nwaanyị, nwụọ n’amụtaghị nwa. Nke abụọ kuchiri nwunye ya a. E mechaa ọ nwụọkwa n’amụtaghị nwa.
Otu ihe ahụ mekwara nwanne ya nke atọ. Ụmụnne asaa ndị a lụchara nwaanyị a ma o nweghị nke mụtara nwa. N’ikpeazụ nwaanyị ahụ n’onwe ya nwụkwara. Na mbilite n’ọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, n’ihina ụmụnne asaa ndị a lụchara ya?”
Jesu zara ha sị, “Ọ bụ na ọ bụghị ihe a ka ụnụ ji ejehie ụzọ, ụnụ amaghị Akwụkwọ Nsọ nke ụnụ na-ama ike nke Chukwu? N’ihina mgbe ha ga-ebilite n’ọnwụ, ha agaghịkwa alụ di na nwunye, ha ga-adị ka ndị mmụọọma nke eluigwe.
Maka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na ụnụ agụtabeghị n’Akwụkwọ nke Mosis ebe e dere banyere ọhịa ahụ otu Chineke si gwa ya okwu sị, “Abụ m Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ụnụ na-ejehie ụzọ n’ihi na ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama ọ bụ Chineke nke ndị dị ndụ”.
Igbo Mass Readings for June 4 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for June 3 2026, Wenezde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.