Igbo Mass Readings for January 15 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 15 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:14-18

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndi Hibru

Ebe ọ bụ ụmụ ahụ ketere oke n’ụdị inwe ahụ na ọbara, ya onwe ya ketekwara oke n’otu ụdị ahụ ahụ, ka o wee site n’ọnwụ mebie ekwensu bụ onye ahụ ji ike nke ọnwụ.

Otu a ka o siri mee ka ndị ahụ niile nwere onwe ha bụ ndị ụjọ ọnwụ mere ka ha bụrụ ndị e kere agbụ na ndụ ha niile. N’eziokwu ndị dị ya mkpa abụghị ndị mmụọọma, kama ọ bụ agbụrụ Abraham.

Nke a mere o ji dị mkpa na ọ ga-eyi ụmụnna ya n’ihe niile ka o wee bụụrụ ha onyeisi nchụaja nwere obi ebere na nke kwesiri ntụkwasịobi n’ije ozi nke Chineke, ka o wee medaa Chineke obi maka njọ ndị mmadụ.

N’ihina ya onwe ya ataala ahụhụ ma nweekwa ọnwụnwa. Nke a mere ka o nwee ike inyere ndị nọ n’ọnwụnwa aka.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105: 1, 5, 8-9, 24-25, 26-27

Azịza: Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.

1. Alleluia: Nyenụ Chineke ekele kpọkuonụ aha ya,

kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya!

Chetanụ ọrụ ebube niile ọ rụrụ,

ọrụ itụnaanya ya niile, na ikpe niile si n’ọnụ ya pụta.

Azịza: Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.

2. Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe,

Iwu nke o tiri puku agbụrụ gara aga.

Ọgbụgbandụ ya na Abraham gbara na iyi nke ọ ñụụrụ Aịzik.

Azịza: Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.

3. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya,

ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!

Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị,

ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile.

Azịza: Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.

4. Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe,

Iwu nke o tiri puku agbụrụ gara aga.

Ọgbụgbandụ ya na Abraham gbara

na iyi nke ọ ñụụrụ Aịzik.

Azịza: Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.

MBEKU

Alleluia, alleluia:

Onye nzọpụta anyị Jesu Kristi mebiri ọnwụ, wetara anyị ndụ, bịa mee ka anwụanwụ pụta ihe site n’oziọma ahụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 1:29-39

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Mgbe ha si n’ụlọnzukọ ahụ pụta n’atụfughị oge, Jesu na Jemis na Jọn banyere n’ụlọ Saịmọn na Andru. Ma nne nwunye Pita dina n’ahụ ọkụ. Ozigbo ahụ ha kọọrọ Jesu maka ahụ mgbu ya.

O jekwuuru ya, jide ya n’aka, wee selite ya. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. O wee malite ile ha ọbịa. Na mgbede ahụ, mgbe anyanwụ dachara, ha kpọtaara Jesu ndị niile ahụ na-adịghị na ndị mmụọ ọjọọ ji.

Ndị obodo ahụ niile zukọrọ n’ihu ụlọ nke Jesu nọ n’ime ya. Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị mmadụ nwere nrịanrịa dị icheiche. Ọ chụpụkwara ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ, o kweghị ha kwuo okwu n’ihina ha maara onye ọ bụ.

Jesu biliri n’isi ụtụtụ tupu chi abọọ gaa ebe dara jii, ma nọrọ ebe ahụ kpee ekpere. Saịmọn na ndị ya na ha nọ bidoro chọgharịba ya. Mgbe ha chọtara ya, ha siri ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị”.

Ma ọ sịrị ha “ka anyị gaanụ n’obodo ndị ọzọ, ka m nwee ike kwusakwaa okwu Chineke n’ebe ahụ; ọ bụ n’ihi nke a ka m jiri bịa”. Ọ gara n’obodo Galili niile, na-ezisa oziọma n’ụlọ ha na achụpụkwa mmụọ ọjọọ.

Igbo Mass Readings for January 16 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for January 15 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.