Igbo Mass Readings for January 14 2026, Wenezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 14 2026, Wenezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-10, 19-20

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel

N’oge ahụ, mgbe nwata ahụ bụ Samuel na-ejere Yahweh ozi n’okpuru Elaị, Yahweh ịgwa ndị mmadụ okwu dị ụkọ; a naghị enwe ọhụ mgbe ọbụla.

O ruo otu abalị, Elaị bụ onye anaghị ahụzi ụzọ nke ọma, nọ n’ụra n’ụlọ ya. Mgbe ahụ Samuel dina n’ụlọnsọ, ebe igbe ọgbụgbandụ Yahweh dị, ọkụ dị ebensọ anyụbeghị. Yahweh akpọọ ya: “Samuel! Samuel! Ọ zaa sị “Anọ ebe a!”

Ọ gbara ọsọ, jekwuru Elaị, sị ya “Abịala m. Ọ kwa ị kpọrọ m?” Elaị sị ya, “Akpọghị m gị. Gaa dina ala”. Samuel wee laghachi dina ala. Ọzọkwa Yahweh akpọọ ya! “Samuel! Samuel” Samuel kuliri jekwuru Elaị sị ya “Abịala m. Ọkwa ị kpọrọ m?” Ọ sị ya “Akpọghị m gị, nwa m; gaa dina ala.”

Mgbe ahụ Samuel n’onwe ya amabeghị ihe ọbụla gbasara Yahweh, Yahweh agwabeghị ya okwu na mbụ. Yahweh wee kpọọ Samuel oku nke ugboro atọ. Okuliri jekwuru Elaị, sị ya, “Abịala m. Ọ kwa ị kpọrọ m?”

Mgbe ahụ, Elaị ghọtara na ọ bụ Yahweh na-akpọ nwata ahụ oku. Ya mere, ọ sịrị ya, “Jee dina ala. Ọ bụrụ na ọ kpọọ gị ọzọ sị ya, ‘Kwuwe Onyenwe m, nwadibo gị na-ege ntị” Samuel wee jee, dina ala ọzọ.

Yahweh bịara guzo n’ebe ahụ, kpọọ ya oku dịka na mbụ: “Samuel! Samuel!” Samuel zaa sị “Kwuwe onyenwe m, nwadibo gị na-ege ntị”.

Samuel wee na-eto. Yahweh nọnyekwara ya, na-emekwa ka ihe niile Samuel kwuru mezuo. Ya mere, ndị Izrel niile, bido na Dan ruo na Biasheba matara na Samuel bụ onye amụma nke Chineke n’ezie.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 40:2-5, 7-8, 8-9, 10

Azịza: Lee m, Dinwenụ, abịara m ime uche gị

1. Echere m, echere m Onyenweanyị.

O wee hulata gee m ntị

Ha were isiọma bụ ndị ahụ tụkwasịrị nchekwube ha n’Onyenweanyị

ndị na-adịghị akwunyere ndị na-eweta ọgbaaghara

na ndị na-efe Chukwu asị.

Azịza: Lee m, Dinwenụ, abịara m ime uche gị

2. Ị naghị achọ ịchụ aja mọbụ ihe nrunye

kama ntị ghe oghe

Ị naghị achọ aja nsureọkụ mọbu aja maka njọ

Kama ekwuru m sị, “Anọ m ebe a, ana m abịa.”

Azịza: Lee m, Dinwenụ, abịara m ime uche gị

3. N’ime akwụkwọ iwu e dere

na m tosịrị ime uche gị Chineke m,

ahụrụ m iwu gị n’anya

Eji m obi m niile hụ ya n’anya.

Azịza: Lee m, Dinwenụ, abịara m ime uche gị

4. Ekwupụtala m eziomume nke Onyenweayị

na nnukwu ọgbakọ

Lee, emechighị m ọnụ

Ị maara nke a O Onyenweanyị.

Azịza: Lee m, Dinwenụ, abịara m ime uche gị

MBEKU

Alleluia, alleluia:

Onye nzọpụta anyị Jesu Kristi mebiri ọnwụ, wetara anyị ndụ, bịa mee ka anwụanwụ pụta ihe site n’oziọma ahụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 1:29-39

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Mgbe ha si n’ụlọnzukọ ahụ pụta n’atụfughị oge, Jesu na Jemis na Jọn banyere n’ụlọ Saịmọn na Andru. Ma nne nwunye Pita dina n’ahụ ọkụ. Ozigbo ahụ ha kọọrọ Jesu maka ahụ mgbu ya.

O jekwuuru ya, jide ya n’aka, wee selite ya. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. O wee malite ile ha ọbịa. Na mgbede ahụ, mgbe anyanwụ dachara, ha kpọtaara Jesu ndị niile ahụ na-adịghị na ndị mmụọ ọjọọ ji. Ndị obodo ahụ niile zukọrọ n’ihu ụlọ nke Jesu nọ n’ime ya.

Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị mmadụ nwere nrịanrịa dị icheiche. Ọ chụpụkwara ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ, o kweghị ha kwuo okwu n’ihina ha maara onye ọ bụ. Jesu biliri n’isi ụtụtụ tupu chi abọọ gaa ebe dara jii, ma nọrọ ebe ahụ kpee ekpere.

Saịmọn na ndị ya na ha nọ bidoro chọgharịba ya. Mgbe ha chọtara ya, ha siri ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị”.

Ma ọ sịrị ha “ka anyị gaanụ n’obodo ndị ọzọ, ka m nwee ike kwusakwaa okwu Chineke n’ebe ahụ; ọ bụ n’ihi nke a ka m jiri bịa”. Ọ gara n’obodo Galili niile, na-ezisa oziọma n’ụlọ ha na achụpụkwa mmụọ ọjọọ.

Igbo Mass Readings for January 15 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for January 14 2026, Wenezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.