Igbo Mass Readings for April 23 2025, Wenezde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 23 2025, Wenezde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-10

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga n’ụlọnsọ ikpe ekpere n’elekere nke atọ n’ehihie bụ oge ekpere. Ha hụrụ otu nwoke dara ngwọrọ site na nwata. Ndị nwe nwoke a na-atọgbọchị ya kwa ụbọchị n’ọnụụzọ ụlọnsọ Chineke, nke ana-akpọ “Ọnụụzọ mma” ịrịọ onyinye ebere n’aka ndị na-aba n’ime ụlọnsọ Chineke.

Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịbanye n’ụlọnsọ Chineke ọ rịọrọ ha ego. Ma Pita na Jọn legidere ya anya, “Lee anyị anya!” O lee ha anya na-atụ anya ịnata ihe n’aka ha.

Ma Pita sịrị ya, “Enweghị m ọlaọcha na ọlaedo kama ihe m nwere ka m ga-enye gị; n’aha Jesu Kristi onye Nazaret, bilie gaa ije!” O jidere ya n’aka nri kpụlie ya elu, ozigbo ụkwụ ya abụọ na ikpere ya sikwaa ike ọzọ.

Ọ wụliri elu, kwụrụ n’ụkwụ abụọ, jegharịa ije n’ebe ahụ. O sooro Pita na Jọn na-aga ije na-awụli elu na-etokwa Chineke. Igwe mmadụ ahụ niile hụrụ ya ka ọ na-aga ije, na-eto Chineke.

Mgbe ha matara na ọ bụ onye ahụ na-anọdụ n’ọnụụzọ mma, nke ụlọnsọ Chineke na arịọ arịrịọ, otu ihe a si mee gbara ha gharịị jukwa ha anya nke ukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105:1-2, 3-4, 6-7, 8-9.

Azịza: Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa

1. Nyenụ Chineke ekele, kpọkuonụ aha ya,

kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya!

Kweerenụ ya ukwe, kụọrọnụ ya egwu,

kwupụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya niile!

Azịza: Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa

2. Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya,

ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa.

Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya,

chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile.

Azịza: Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa

3. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya,

ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!

Ọ bụ ya bụ Onyenweanyi na Chineke anyị,

Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile.

Azịza: Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa

4. Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe,

Iwu nke o tiiri puku agbụrụ gara aga,

Ọgbụgbandụ ya na Abraham gbara

na iyi nke ọ ñụụrụ Aịzik.

Azịza: Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee añụrị ka obi dị anyị ụtọ na ya.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 24: 13-35.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’ụbọchị ahụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jesu gaje otu obodo nta a na-akpọ Emaus nke dị ihe dịka Maịl asaa site n’Jerusalem. Ha na-akọrịtakwa n’etiti onwe ha, gbasara ihe niile a merenụ.

Ka ha na-akọrịta akụkọ ma na-ajụrịtakwa onwe ha ajụjụ, Jesu n’onwe ya bịaruru ha nso, sorokwa ha na-aga. Ma emechiri anya ha ịmata na ọ bụ Jesu. Ọ jụrụ ha sị: Gịnị ka ụnụ na- akọrịta n’etiti ụnụ ka ụnụ na-aga?”

Ha kwụsịrị ebe ahụ gbarụọ ihu. Mgbe ahụ ka otu onye n’ime ha a na-akpọ Kleopas jụrụ ya sị, “Ọ bụ naanị gị bụ onye ọbịa na Jerusalem na-amaghị ihe ndị a niile mere ebe ahụ n’ụbọchị ndị a?”

Jesu jụrụ ha sị: “Ihe dịka gịnị?” Ha zara ya sị: gbasara Jesu onye Nazaret, onye bụ onye amụma, bụrụkwa onye dị ike n’okwu na n’ọrụ ebube n’ihu Chukwu na n’anya mmadụ niile.

Na otu ndị isi nchụaja na ndị isi ọchịchị ji rara ya nye ka a maa ya ikpe ọnwụ ma kpọgbuokwa ya n’obe. Anyị nweburu olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta ụmụ Izrel.

Ọ bụghịkwa sọ nke a, mkpụrụ ụbọchị atọ agachaala kamgbe ihe a mere, ma nke kacha nke, ụfọdụ ụmụnwaanyị n’ime ndị otu anyị mere ka obi fepụ anyị.

Ha mara ụzọ gaa n’ili ebe e liri ya, ma ha ahụghị ozu ya. Ha lọghachiri na-akọrọ anyị na ha hụkwururịị ndị mmụọọma n’ọhụ, ndị sị na Jesu dị ndụ. Ụfọdụ n’ime ndị otu anyị gakwara n’ili hụkwa ya dịka otu ụmụnwaanyị ndị ahụ siri kwuo.

Ma ha ahụghị Jesu n’onwe ya.” Jesu gwara ha sị: Ụnụ ndị enweghị ọgụgụ isi, ndị o sirikwaara ike n’obi ikwenye n’ihe niile ndị amụma kwuru! Ọ bụ na ọ dịghị mkpa na Kristi ahụ ga-ata ahụhụ ndị a wee banye n’ọchịchị nke ebube ya?”

Jesu bidoro kọwara ha ihe niile e dere n’Akwụkwọ Nsọ banyere ya onwe ya, site n’Akwụkwọ Mosis wee ruo na nke ndị amụma. Ha gagidere bịaruo nso n’obodo nta ahụ ha na-aga. Jesu mere ka ọ na-agafe obodo nta ahụ, ma ha rịọsiri ya ike sị: “Nọnyere anyị n’ihina chi ejiwela, ụbọchị agamikwaala ugbu a.”

Jesu wee kwenye banye n’ụlọ ịnọnyere ha. Ka ha na Jesu nọ na-eri nri anyasị. O were achịcha gọzie, nyawaa ya were ya nye ha. Anya ha meghere, ha wee mata onye ọ bụ. Ozigbo ahụ ha ahụkwaghị ya ọzọ.

Ha jụrịtara onwe ha sị, “Ọ bụ na obi anyị anụghị anyị ọkụ mgbe Ọ na-agwa anyị okwu n’ụzọ, mgbe ọ na-ekpughere anyị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ?”

Ha biliri n’otu oge ahụ laghachi na Jerusalem. Ha hụkwara ndị na-eso ụzọ Jesu iri na otu ahụ na ndị ha na ha nọ ka ha gbakọtara n’otu ebe; Ndị kwuru sị, “Onyenweanyị ebilitela n’eziokwu.

O gosikwara Saịmọn onwe ya!” Ha mmadụ abụọ kọọrọ ndị ọzọ ihe mere n’ụzọ, na ka ha si mata onye ọ bụ site na-ịnyawa achịcha.

Igbo Mass readings for April 24 2025, Tọọzde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for April 23 2025, Wenezde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.