Werenụ Onwe Gị nye Chukwu [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Werenụ Onwe Gị nye Chukwu‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Werenụ Onwe Gị nye Chukwu Lyrics

Chorus: Werenụ onwe gị nye Chukwu Onye n’asị gị atụna uche. Gbasara ihe ị ga-eri m’ọbụ ihe ị ga-eyi n’ahụ, lekene ụmụ nnụnụ igwe ha nwere ubi m’ọbụ ọba mana Chukwu Nna na-azụ ha ma-fọ ndị ọ nwụrư n’ihi ha. Bugodụ ụzọ chọba alaeze Nna n’ezi omume ha, ihe ndị ọzọ n’akpa ụnụ, Chukwu ga-ahụ maka ha. (DC)

1. Welite obi gị elu ebe Chukwu Nna nọ.

Ebe akụ mmadụ nọ ebe ahụ k’obi ya nọ.

Kedụ Nna nwa ga-arịọ azụ, maọbụ rịọ achịcha,

O were agwọ nye ya, maọbụ nye ya okwute.

2. Ụnụ ndị obi kpọrọ nkụ, ụnụ ndị ome njọ

makwara ihe dị mma. Nk’ụnụ ga-enye ụmụ ụnụ.

Ọ bụ Nna ụnụ bi n’igwe onye bụ sọsọ mma

Ọ bụ n’onweghị ike, inye ụnụ ihe ọma kariri nke a.

3. Chọwa ịgachọta ụzọ nke ndụ ebebe

Onye kụrụ aka ka aga emeghere ụzọ

Kedụ nna nwa ya ga-arịọ azụ,

maọbụ rịọ achịcha, o were agwọ nye ya,

maọbụ nye ya okwute.

4. Ndụ anyị n’ụwa dị nkenke,

Eluigwe dị ebebe,

Kedụ ihe nke ị na-eme

ka I nweta ndụ ebebe.

Other Igbo Offertory Hymns

Other Catholic Hymns